Native Bible

Galatians 6:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụladị ndị kwere ka e bie ha ugwu, anaghị edebe iwu, kama ha chọrọ ka e bie unu ugwu ka ha nwee ike jiri ya nyaa isi nʼanụ ahụ.

Galatians 6:13 in English

Galatians 6:13 · Berean Standard Bible

For the circumcised do not even keep the law themselves, yet they want you to be circumcised that they may boast in your flesh.

Context

11Leenu otu mkpụrụ akwụkwọ m ji aka m dee nʼakwụkwọ ozi a si gbaa okpotokpo. 12Ọ bụ ndị na-achọ ka a hụ ha nʼanụ ahụ, bụ ndị ga-amanye unu ka e bie unu ugwu, naanị ihe ha ji eme otu a bụ ka a ghara ịkpagbu ha nʼihi obe Kraịst. 13Ọ bụladị ndị kwere ka e bie ha ugwu, anaghị edebe iwu, kama ha chọrọ ka e bie unu ugwu ka ha nwee ike jiri ya nyaa isi nʼanụ ahụ. 14Ka m gharakwa ịnya isi nʼihe ọbụla karịakwa nʼobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nke e sitere na ya kpọgbuo ụwa nʼebe m nọ, ma kpọgbukwaa mụ onwe m nʼebe ụwa nọ. 15Obibi ugwu abụghị ihe, ebighị ugwu abụghịkwa ihe, kama ị bụ onye e kere ọhụrụ bụ ihe dị mkpa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.