Ndị Galeshịa 4:29
Galatians 4:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge ahụ, nwa ahụ a mụrụ nʼụzọ anụ ahụ kpagburu nwa ahụ a mụrụ site nʼike nke Mmụọ Nsọ. Otu a ka ọ dịkwa nʼoge a.
Galatians 4:29 in English
Galatians 4:29 · Berean Standard Bible
At that time, however, the son born by the flesh persecuted the son born by the Spirit. It is the same now.
Context
27Nʼihi na e dere ya,
“Ṅụrịa ọṅụ, gị nwanyị aga,
onye na-amụtaghị nwa.
Tie mkpu ọṅụ, tisiekwa mkpu akwa ike
gị onye ime nwa na-emetụbeghị,
nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ
karịa ụmụ nke nwanyị nwere dị.”* 28Ugbu a, ụmụnna m, unu bụ ụmụ ahụ nke e kwere na nkwa, dị ka Aịzik. 29Nʼoge ahụ, nwa ahụ a mụrụ nʼụzọ anụ ahụ kpagburu nwa ahụ a mụrụ site nʼike nke Mmụọ Nsọ. Otu a ka ọ dịkwa nʼoge a. 30Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya, nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị a apụghị isoro nwa nke nwanyị na-abụghị ohu kerikọta oke.”* 31Ya mere, ụmụnna m, anyị abụghị ụmụ nke nwanyị ohu, kama anyị bụ ụmụ nke nwanyị nwere onwe ya.
4:27 Aịz 54:1
4:30 Jen 21:10
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.