Ndị Galeshịa 4:26
Galatians 4:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nwanyị nke ọzọ nọ ọnọdụ Jerusalem nke dị nʼelu, nke nwe onwe ya. Ọ bụkwa ya bụ nne anyị.
Galatians 4:26 in English
Galatians 4:26 · Berean Standard Bible
But the Jerusalem above is free, and she is our mother.
Context
24Anyị ga-ewere ihe ndị a dị ka ihe ịmaatụ, nʼihi na ụmụ nwanyị abụọ ndị a nọchiri anya ọgbụgba ndụ abụọ. Otu ọgbụgba ndụ sitere nʼUgwu Saịnaị ma mụọkwa ụmụ ndị bụ ohu: nke a bụ Hega. 25Hega bụ Ugwu Saịnaị nke dị nʼArebịa. Ọ dabara nʼọnọdụ Jerusalem nke ugbu a, nʼihi na ya na ụmụ ya nọ nʼohu. 26Ma nwanyị nke ọzọ nọ ọnọdụ Jerusalem nke dị nʼelu, nke nwe onwe ya. Ọ bụkwa ya bụ nne anyị. 27Nʼihi na e dere ya,
“Ṅụrịa ọṅụ, gị nwanyị aga,
onye na-amụtaghị nwa.
Tie mkpu ọṅụ, tisiekwa mkpu akwa ike
gị onye ime nwa na-emetụbeghị,
nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ
karịa ụmụ nke nwanyị nwere dị.”* 28Ugbu a, ụmụnna m, unu bụ ụmụ ahụ nke e kwere na nkwa, dị ka Aịzik.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.