Native Bible

Galatians 3:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ Ebraham ka e kwere nkwa ya na mkpụrụ ya. Akwụkwọ nsọ asịghị, “nʼọtụtụ mkpụrụ,”* kama, ọ sịrị, “ma nye mkpụrụ gị,” ya bụ otu onye, onye bụ Kraịst.

Galatians 3:16 in English

Galatians 3:16 · Berean Standard Bible

The promises were spoken to Abraham and to his seed. The Scripture does not say, “and to seeds,” meaning many, but “and to your seed,”* meaning One, who is Christ.

Context

14Ọ dị otu a ka ngọzị ahụ e nyere Ebraham bụrụkwa nke ndị mba ọzọ site na Kraịst Jisọs. Ka anyị niile site nʼokwukwe nata nkwa ahụ, bụ Mmụọ Nsọ. 15Ụmụnna m, ka m were ihe nlere anya site na ndụ a na-adị kwa ụbọchị kọwaa okwu a: Dị ka mmadụ na-enweghị ike iwepụ maọbụ ịtụkwasị ihe nʼọgbụgba ndụ e mere ka o guzosie ike, otu a ka ọ dịkwa nʼọnọdụ a. 16Ọ bụ Ebraham ka e kwere nkwa ya na mkpụrụ ya. Akwụkwọ nsọ asịghị, “nʼọtụtụ mkpụrụ,”* kama, ọ sịrị, “ma nye mkpụrụ gị,” ya bụ otu onye, onye bụ Kraịst. 17Ihe m na-akọwa bụ nke a: Iwu ahụ e mere ka ọ malite ịdị narị afọ anọ na iri atọ (430) site na mgbe e kwere nkwa ahụ, emeghị ka ọgbụgba ndụ ahụ Chineke mere ka ọ dịrị hapụ iguzokwa, o mekwaghị ka nkwa ahụ bụrụ ihe e wezugara ewezuga. 18Ọ bụrụ na inweta ihe nketa nke ya na nkwa ahụ so dabeere nʼiwu, mgbe ahụ, ihe nketa ahụ adabereghị na nkwa e kwere. Ma Chineke sitere nʼamara nye Ebraham ihe nketa ahụ site na nkwa o kwere ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.