Ndị Galeshịa 2:8
Galatians 2:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na Chineke onye si nʼaka Pita na-arụ ọrụ onyeozi oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu, sikwa nʼime m na-arụ ọrụ onyeozi izisara ndị mba ọzọ oziọma.
Galatians 2:8 in English
Galatians 2:8 · Berean Standard Bible
For the One who was at work in Peter’s apostleship to the circumcised was also at work in my apostleship to the Gentiles.
Context
6Banyere ndị a na-ewe ka ndị dị ndu dị mkpa, ihe ọbụla ọnọdụ ha bụ ewetaghị mgbanwe ọbụla nʼebe m nọ, nʼihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya nʼihu. Ndị ahụ atụkwasịghị ihe ọbụla nʼoziọma m na-ezisa. 7Ma nʼaka nke ọzọ, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izisa oziọma nʼetiti ndị e bighị ugwu, dịka e nyere Pita izisa oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu. 8Nʼihi na Chineke onye si nʼaka Pita na-arụ ọrụ onyeozi oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu, sikwa nʼime m na-arụ ọrụ onyeozi izisara ndị mba ọzọ oziọma. 9Mgbe Jemis, Sefas na Jọn ndị a maara dị ka ide ji ụlọ nʼetiti ndị ndu ahụ niile nara m na Banabas aka nnwekọ, nabatakwa amara e nyere m. Ha gbara anyị ume, sị anyị gaa nʼihu nʼọrụ anyị, ikwusa oziọma nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha kwa gaa nʼihu ịrụ ọrụ nke ha nʼetiti ndị e biri ugwu. 10Ọ bụ naanị otu ihe ka ha rịọrọ anyị, nke bụ ka anyị cheta ndị ogbenye. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike ime.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.