Native Bible

Galatians 2:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nʼaka nke ọzọ, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izisa oziọma nʼetiti ndị e bighị ugwu, dịka e nyere Pita izisa oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu.

Galatians 2:7 in English

Galatians 2:7 · Berean Standard Bible

On the contrary, they saw that I had been entrusted to preach the gospel to the uncircumcised, just as Peter had been to the circumcised.

Context

5Ma o nweghị oge anyị ji gee ntị nʼihe ha kwuru, nʼihi na anyị chọrọ ichedo eziokwu ahụ dị nʼoziọma ka a ghara ịgwa ya ihe ọbụla nʼetiti unu. 6Banyere ndị a na-ewe ka ndị dị ndu dị mkpa, ihe ọbụla ọnọdụ ha bụ ewetaghị mgbanwe ọbụla nʼebe m nọ, nʼihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya nʼihu. Ndị ahụ atụkwasịghị ihe ọbụla nʼoziọma m na-ezisa. 7Ma nʼaka nke ọzọ, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izisa oziọma nʼetiti ndị e bighị ugwu, dịka e nyere Pita izisa oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu. 8Nʼihi na Chineke onye si nʼaka Pita na-arụ ọrụ onyeozi oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu, sikwa nʼime m na-arụ ọrụ onyeozi izisara ndị mba ọzọ oziọma. 9Mgbe Jemis, Sefas na Jọn ndị a maara dị ka ide ji ụlọ nʼetiti ndị ndu ahụ niile nara m na Banabas aka nnwekọ, nabatakwa amara e nyere m. Ha gbara anyị ume, sị anyị gaa nʼihu nʼọrụ anyị, ikwusa oziọma nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha kwa gaa nʼihu ịrụ ọrụ nke ha nʼetiti ndị e biri ugwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.