Ndị Galeshịa 2:17
Galatians 2:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụrụ, na mgbe anyị na-achọ ka a gụọ anyị dị ka ndị ezi omume nʼime Kraịst, anyị onwe anyị a bụrụ ndị achọpụtara dịka ndị mmehie. Nke a, ọ pụtara na Kraịst na-akwado mmehie? Mba!
Galatians 2:17 in English
Galatians 2:17 · Berean Standard Bible
But if, while we seek to be justified in Christ, we ourselves are found to be sinners, does that make Christ a minister of sin? Certainly not!
Context
15Anyị onwe anyị bụ ndị Juu site nʼọmụmụ a mụrụ anyị, anyị abụkwaghị ndị mba ọzọ ndị mmehie, 16ma anyị maara na a dịghị agụ mmadụ ọbụla dị ka onye ezi omume site nʼọrụ nke iwu kama ọ bụ naanị site nʼokwukwe na Jisọs Kraịst. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst ka a gụọ anyị na ndị ezi omume, site nʼokwukwe anyị kwere na Kraịst, ọ bụghị nʼihi na anyị rụrụ ọrụ nke iwu. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a ga-agụnye ka onye ezi omume nʼihi na ọ rụrụ ọrụ nke iwu. 17Ma ọ bụrụ, na mgbe anyị na-achọ ka a gụọ anyị dị ka ndị ezi omume nʼime Kraịst, anyị onwe anyị a bụrụ ndị achọpụtara dịka ndị mmehie. Nke a, ọ pụtara na Kraịst na-akwado mmehie? Mba! 18Kama, ọ bụrụ na m ewugharịa ihe ndị ahụ m buru ụzọ mebie, ana m egosi na m bụ onye na-emebi iwu. 19Nʼihi na-esitere m nʼaka iwu nwụọ nʼebe iwu dị, ka m nwee ike dị ndụ nʼebe Chineke nọ. Akpọgidela mụ na Kraịst nʼobe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.