Ezra 9:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma gị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel, ị bụ onye ezi omume. Lee anyị ka anyị guzo nʼihu gị nʼọnọdụ ikpe ọmụma anyị, ọ bụ ezie na o nweghị onye ọbụla nʼime anyị kwesiri iguzo nʼihu gị nʼihi nke a.” 9:1 Omume rụrụ arụ, ọ bụ mgbe ọnwa itoolu gasịrị site na nʼoge Ezra lọghachiri Jerusalem ka ha mere ihe ndị a megidere iwu Chineke nyere ha nʼakwụkwọ. Dit 7:3-4; Nkp 3:5-6. 9:3 ịdọwa uwe bụ otu ihe na-egosi ọnọdụ iru ụjụ. E depụtara nke a nʼakwụkwọ Lev 10:6; Neh 13:25; 10:29-30. 9:9 Ndị ohu Nʼoge a ndị Juu nọọ nʼokpuru ọchịchị alaeze ọzọ. Neh 9:36; Dit 28:47-48
Ezra 9:15 in English
Ezra 9:15 · Berean Standard Bible
O LORD, God of Israel, You are righteous! For we remain this day as a remnant. Here we are before You in our guilt, though because of it no one can stand before You.”
Context
13“Ma ihe niile dakwasịrị anyị bụ maka ajọ omume anyị, nʼihi ikpe ọmụma dị ukwuu anyị. Ma lee, Chineke anyị ataghị anyị ahụhụ dịka ịdị ukwuu nke mmehie anyị si dị, kama, o mekwara ka ole na ole nʼime anyị fọdụ. 14Ma anyị ọ ga-emebi iwu gị ọzọ, site nʼịlụ ndị a rụrụ arụ nʼomume ha? Ị gaghị eweso anyị iwe ruo na ị ga-ebibi anyị kpamkpam, na-afọdụghị otu onye? 15Ma gị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel, ị bụ onye ezi omume. Lee anyị ka anyị guzo nʼihu gị nʼọnọdụ ikpe ọmụma anyị, ọ bụ ezie na o nweghị onye ọbụla nʼime anyị kwesiri iguzo nʼihu gị nʼihi nke a.”
9:1 Omume rụrụ arụ, ọ bụ mgbe ọnwa itoolu gasịrị site na nʼoge Ezra lọghachiri Jerusalem ka ha mere ihe ndị a megidere iwu Chineke nyere ha nʼakwụkwọ. Dit 7:3-4; Nkp 3:5-6.
9:3 ịdọwa uwe bụ otu ihe na-egosi ọnọdụ iru ụjụ. E depụtara nke a nʼakwụkwọ Lev 10:6; Neh 13:25; 10:29-30.
9:9 Ndị ohu Nʼoge a ndị Juu nọọ nʼokpuru ọchịchị alaeze ọzọ. Neh 9:36; Dit 28:47-48
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.