Ezra 8:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Akpọkọtara m ha nʼakụkụ osimiri na-erubanye nʼAhava, anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị atọ. Mgbe m leruru anya nʼetiti ndị mmadụ zukọrọnụ, ha na ndị nchụaja bịara, a chọpụtara m na o nweghị ọ bụladị otu onye Livayị nọ nʼebe ahụ.
Ezra 8:15 in English
Ezra 8:15 · Berean Standard Bible
Now I assembled these exiles at the canal that flows to Ahava, and we camped there three days. And when I searched among the people and priests, I found no Levites there.
Context
13Ndị sitere nʼikwu Adonikam,
ndị ikpeazụ, ndị aha ha bụ Elifelet, na Jeuel na Shemaya na iri ndị ikom isii (60) bụ ndị so ha, 14ndị sitere nʼikwu Bigvai,
Utai na Zakua na iri ndị ikom asaa (70) bụ ndị so ha. 15Akpọkọtara m ha nʼakụkụ osimiri na-erubanye nʼAhava, anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị atọ. Mgbe m leruru anya nʼetiti ndị mmadụ zukọrọnụ, ha na ndị nchụaja bịara, a chọpụtara m na o nweghị ọ bụladị otu onye Livayị nọ nʼebe ahụ. 16Mgbe ahụ, ezigara m ozi kpọọ Elieza, Ariel, Shemaya, Elnatan, Jarib, Elnatan, Netan, Zekaraya na Meshulam, ndị bụ ndịisi. Ezikwara m ozi kpọọ Joiarib na Elnatan, bụ ndị maara ihe. 17Enyere m ha iwu ka ha gakwuru Ido, onyendu nọ na Kasifia. Agwara m ha ihe ha ga-agwa Ido na ndị Livayị ibe ya, bụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ dị na Kasifia, ka ha zite ndị ga-eje ozi ka ha bịakwute anyị maka ụlọnsọ Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.