Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ndị sitere nʼikwu Bigvai, Utai na Zakua na iri ndị ikom asaa (70) bụ ndị so ha.

Ezra 8:14 in English

Ezra 8:14 · Berean Standard Bible

and from the descendants of Bigvai, both Uthai and Zaccur,* and with them 70 men.

Context

12ndị sitere nʼikwu Azgad, Johanan nwa Hakatan na narị ndị ikom na iri (110). 13Ndị sitere nʼikwu Adonikam, ndị ikpeazụ, ndị aha ha bụ Elifelet, na Jeuel na Shemaya na iri ndị ikom isii (60) bụ ndị so ha, 14ndị sitere nʼikwu Bigvai, Utai na Zakua na iri ndị ikom asaa (70) bụ ndị so ha. 15Akpọkọtara m ha nʼakụkụ osimiri na-erubanye nʼAhava, anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị atọ. Mgbe m leruru anya nʼetiti ndị mmadụ zukọrọnụ, ha na ndị nchụaja bịara, a chọpụtara m na o nweghị ọ bụladị otu onye Livayị nọ nʼebe ahụ. 16Mgbe ahụ, ezigara m ozi kpọọ Elieza, Ariel, Shemaya, Elnatan, Jarib, Elnatan, Netan, Zekaraya na Meshulam, ndị bụ ndịisi. Ezikwara m ozi kpọọ Joiarib na Elnatan, bụ ndị maara ihe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.