Ezra 6:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha wusiri ya nʼabalị nke atọ nʼọnwa isii (dị ka ọgụgụ afọ ndị Juu si dị) nʼafọ nke isii nke ọchịchị Daraiọs.
Ezra 6:15 in English
Ezra 6:15 · Berean Standard Bible
And this temple was completed on the third day of the month of Adar,* in the sixth year of the reign of King Darius.
Context
13Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze Daraiọs zitere, Tatenai, onyeisi ọchịchị nʼala ofe mmiri, na Sheta Bozenai, na ndị otu ha, mere ihe niile dịka ozi ahụ si dị na-atụfughị oge ọbụla. 14Nʼihi ya, ndịisi Juu gara nʼihu nʼọrụ, ihe na-agakwara ha nke ọma site na nkwusa onye amụma, bụ Hegai, na Zekaraya, nwa Ido. Ha wuchara ụlọnsọ ahụ dịka iwu Chineke Izrel nyere si dị, nakwa dịka Sairọs, na Daraiọs, na Ataksekses, ndị eze Peshịa, nyekwara nʼiwu. 15Ha wusiri ya nʼabalị nke atọ nʼọnwa isii (dị ka ọgụgụ afọ ndị Juu si dị) nʼafọ nke isii nke ọchịchị Daraiọs. 16Ụmụ Izrel, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị fọdụrụ nʼime ndị e mere ka ha ga biri nʼala ọzọ, ji ọṅụ mee mmemme nke ido ụlọ nke Chineke ahụ nsọ na gbaghee ya. 17Nʼihi ido ụlọ ahụ nsọ, ha ji oke ehi dị otu narị nʼọnụọgụgụ, na narị ebule abụọ, na narị atụrụ anọ chụọ aja, werekwa mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile, dịka ebo niile nke Izrel si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.