Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lezienụ anya ka unu ghara i lepụrụ okwu a anya. Gịnị ga-eme ka a hapụ ihe iyi egwu a ka ọ gaa nʼihu, ime ka ihe jọrọ alaeze a njọ karịa?

Ezra 4:22 in English

Ezra 4:22 · Berean Standard Bible

See that you do not neglect this matter. Why allow this threat to increase and the royal interests to suffer?

Context

20Jerusalem e nweela ụfọdụ ndị eze nke chịrị nʼIzrel, ndị dị ike a maara aha ha, ndị alaeze ha gbasara rute nʼosimiri Yufretis, ndị a na-atụkwara ụtụ dị iche iche. 21Ugbu a, nye iwu ka ndị ikom ndị ahụ kwụsị ọrụ, ka a ghara iwuzi obodo a tutu ruo mgbe m ga-enye iwu. 22Lezienụ anya ka unu ghara i lepụrụ okwu a anya. Gịnị ga-eme ka a hapụ ihe iyi egwu a ka ọ gaa nʼihu, ime ka ihe jọrọ alaeze a njọ karịa? 23Ngwangwa a gụrụ akwụkwọ ozi si nʼaka eze Ataksekses, nye Rehum na Shimshai bụ ode akwụkwọ, na ndị otu ha, ha mere ọsịịsọ gakwuru ndị Juu na Jerusalem jiri ike kwagide ha ka ha kwụsị ịrụ ọrụ ahụ. 24Ya mere, ha kwụsịrị ịrụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke na Jerusalem tutu ruo nʼafọ abụọ nke ọchịchị Daraiọs eze Peshịa. 4:1 Sameria bụ isi obodo alaeze ugwu, ndị agbụrụ Benjamin bụ ndị bi nʼobodo ugwu Izrel, ya mere ha ji bụrụ ndị Sameria. 4:10 Maọbụ, Osanapa, dịka e si sụgharịa ya nʼakwụkwọ nsọ ụfọdụ 4:19 Ebe a na-arụtụ aka na nsogbu, na nnupu isi dịrịị nʼoge ọchịchị eze Hezekaya, Jehoiakim nakwa Zedekaya, megide ọchịchị ike nke ndị iro ha na-achị ha. 2Ez 18; 19; 2Ez 24:20; 2Ih 36:13.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.