Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

na ọtụtụ ndị ọzọ ahụ onye ukwu ahụ na onye a na-asọpụrụ bụ Ashobanipal* si nʼala ha bupụ bute na Sameria, na obodo ndị ọzọ dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis.”

Ezra 4:10 in English

Ezra 4:10 · Berean Standard Bible

and the rest of the peoples whom the great and honorable Ashurbanipal * deported and settled in the cities of Samaria and elsewhere west of the Euphrates.*

Context

8Ndị ọzọ soro ha gbaa ajọ izu a bụ Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ. Ha deere Ataksekses akwụkwọ megide ndị Jerusalem sị ya: 9“Akwụkwọ ozi a si nʼaka Rehum, onyeisi agha na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu anyị ndị ọzọ, na ndị ikpe, na ndịisi obodo na-elekọta ndị ahụ niile si Tripolis, na Peshịa, na Erek, na Babilọn, na Susa nke dị nʼElam, 10na ọtụtụ ndị ọzọ ahụ onye ukwu ahụ na onye a na-asọpụrụ bụ Ashobanipal* si nʼala ha bupụ bute na Sameria, na obodo ndị ọzọ dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis.” 11Nke a bụ ihe ha dere nʼakwụkwọ ha zigaara Eze Ataksekses. Ọ bụ gị, eze ukwu Ataksekses, ka ndị ohu gị bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis na-edetara akwụkwọ a. 12Nke a bụ ime ka ị mata na ndị Juu si Babilọn lọta Jerusalem ọhụrụ a ebidola iwughachi obodo ọjọọ nke nnupu isi ahụ. Ha ewuolarị mgbidi ya, tọkwaa ntọala ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.