Ezra 3:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ji abụ otuto na ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ sị: “Ọ dị mma, ịhụnanya ya nʼebe Izrel nọ na-adị ruo ebighị ebi.” Mmadụ niile jiri oke olu too Onyenwe anyị nʼihi ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ ha tọrọ.
Ezra 3:11 in English
Ezra 3:11 · Berean Standard Bible
And they sang responsively with praise and thanksgiving to the LORD: “For He is good; for His loving devotion * to Israel endures forever.” Then all the people gave a great shout of praise to the LORD, because the foundation of the house of the LORD had been laid.
Context
9Jeshua na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụnne ya, Kadmiel na ụmụ ya, ndị si nʼikwu Hodavaya, ha na ụmụ Henadad na ụmụ ha, na ụmụnna ha, ha niile bụ ndị Livayị, jikọtara aka na-elekọta ndị na-arụ ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ. 10Mgbe ndị na-ewu ụlọ tọrọ ntọala ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ, ndị nchụaja ahụ niile yii uwe ha jide opi nʼaka. Otu a kwa ndị Livayị, ụmụ ndị ikom Asaf jikwa ogene ha na-eto Onyenwe anyị dịka usoro iwu Devid, eze Izrel nyere ha si dị. 11Ha ji abụ otuto na ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ sị:
“Ọ dị mma,
ịhụnanya ya nʼebe Izrel nọ na-adị ruo ebighị ebi.”
Mmadụ niile jiri oke olu too Onyenwe anyị nʼihi ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ ha tọrọ. 12Ma ụfọdụ ndị merela agadi nʼetiti ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị ndu nke ikwu dị iche iche, bụ ndị chetara ụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn wuru, kwara akwa hie nne, mgbe ndị ọzọ nọ na-eti mkpu ọṅụ. 13Ya mere, e sitere nʼebe dị nnọọ anya nụ ụzụ ọṅụ na ụda akwa ndị mmadụ ahụ. Ma o nweghị onye nwere ike ịkọwata nke bụ mkpu akwa maọbụ mkpu ọṅụ, nʼihi na ụzụ ahụ dị ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.