Ezra 3:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị na-ewu ụlọ tọrọ ntọala ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ, ndị nchụaja ahụ niile yii uwe ha jide opi nʼaka. Otu a kwa ndị Livayị, ụmụ ndị ikom Asaf jikwa ogene ha na-eto Onyenwe anyị dịka usoro iwu Devid, eze Izrel nyere ha si dị.
Ezra 3:10 in English
Ezra 3:10 · Berean Standard Bible
When the builders had laid the foundation of the temple of the LORD, the priests in their apparel with trumpets, and the Levites (the sons of Asaph) with cymbals, took their positions to praise the LORD, as David king of Israel had prescribed.
Context
8Nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ site mgbe ha bịarutere nʼụlọ Chineke na Jerusalem. Mmadụ niile ahụ lọtara Juda so rụọ ọrụ. Zerubabel nwa Shealtiel, Jeshua nwa Jozadak na ndị fọdụrụ na ụmụnne ha, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị niile si na ndọta nʼagha lọta Jerusalem, malitere ịrụ ọrụ ahụ. Ha họpụtara ndị Livayị niile gbara iri afọ abụọ rigoo ka ha lekọta ihe banyere ọrụ ụlọ Onyenwe anyị. 9Jeshua na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụnne ya, Kadmiel na ụmụ ya, ndị si nʼikwu Hodavaya, ha na ụmụ Henadad na ụmụ ha, na ụmụnna ha, ha niile bụ ndị Livayị, jikọtara aka na-elekọta ndị na-arụ ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ. 10Mgbe ndị na-ewu ụlọ tọrọ ntọala ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ, ndị nchụaja ahụ niile yii uwe ha jide opi nʼaka. Otu a kwa ndị Livayị, ụmụ ndị ikom Asaf jikwa ogene ha na-eto Onyenwe anyị dịka usoro iwu Devid, eze Izrel nyere ha si dị. 11Ha ji abụ otuto na ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ sị:
“Ọ dị mma,
ịhụnanya ya nʼebe Izrel nọ na-adị ruo ebighị ebi.”
Mmadụ niile jiri oke olu too Onyenwe anyị nʼihi ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ ha tọrọ. 12Ma ụfọdụ ndị merela agadi nʼetiti ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị ndu nke ikwu dị iche iche, bụ ndị chetara ụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn wuru, kwara akwa hie nne, mgbe ndị ọzọ nọ na-eti mkpu ọṅụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.