Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ha bịarutere nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye afọ ofufu maka i ji rụzie ụlọ Chineke ka o guzo nʼọnọdụ ya.

Ezra 2:68 in English

Ezra 2:68 · Berean Standard Bible

When they arrived at the house of the LORD in Jerusalem, some of the heads of the families gave freewill offerings to rebuild the house of God on its original site.

Context

66Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ebe ịnyịnya muul dị narị abụọ na iri anọ na ise (245). 67Ịnyịnya kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa, na iri abụọ (6,720). 68Mgbe ha bịarutere nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye afọ ofufu maka i ji rụzie ụlọ Chineke ka o guzo nʼọnọdụ ya. 69Onye ọbụla nʼime ha webatara nʼụlọakụ ihe o nwere ike inye nʼihi ọrụ a. Ha nyere darik ọlaedo dị puku iri isii na otu (61,000),* maịna ọlaọcha dị puku ise (5,000)* na onyinye uwe ndị nchụaja, otu narị (100). 70Ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị na-eche ọnụ ụzọ ama, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ ọzọkwa, ha na ndị Izrel niile fọdụrụ gara biri nʼobodo nke aka ha. 2:2 Nehemaya a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe a, abụghị nke dere akwụkwọ Nehemaya 2:25 Maọbụ, Kiriat Arim 2:41 Asaf bụ otu nʼime ndị Livayị, onye Devid họpụtara maka ịhụ ihe banyere abụ. 1Ih 15:19; 16:5 2:42 Ndị a bụ ndị nche ụlọ ukwu, ha si nʼebo Livayị. 1Ih 15:18 2:43 Maọbụ, ikwu 2:65 Tinyere ndị Livayị na-abụ abụ, e nwere ọtụtụ ndị ọzọ na-abụ abụ nʼoge mmemme dị iche iche, dịka nʼoge ọlụlụ nwanyị, na nʼoge mmemme olili, ya bụ ọnwụ. 2:69 Maọbụ, narị kilogram ise, 2:69 Maọbụ, ọlaọcha ruru puku kilogram atọ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.