Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nzukọ niile ahụ zara nʼotu olu sị. “Okwu gị ziri ezi, Anyị aghaghị ime dịka i kwuru.”

Ezra 10:12 in English

Ezra 10:12 · Berean Standard Bible

And the whole assembly responded in a loud voice: “Truly we must do as you say!

Context

10Mgbe ahụ Ezra onye nchụaja, biliri ọtọ, sị ha, “Unu emehiela, nʼihi na unu lụrụ ndị inyom mba ọzọ, si otu a tụkwasị ihe nʼikpe ọmụma dịrị Izrel. 11Ugbu a, sọpụrụnụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna unu ha, meekwanụ ihe bụ nzube ya. Kewapụnụ onwe unu site nʼebe ndị mba ọzọ nọ, nakwa ebe nwunye ndị unu si mba ọzọ lụta.” 12Nzukọ niile ahụ zara nʼotu olu sị. “Okwu gị ziri ezi, Anyị aghaghị ime dịka i kwuru.” 13Ma ha zakwara sị, “Nke a abụghị ihe anyị ga-eme nʼotu ụbọchị maọbụ nʼụbọchị abụọ, nʼihi na aka ọtụtụ mmadụ nʼime anyị dị na mmehie ahụ. Mmiri na-ezosikwa ike, anyị enwekwaghị ike ịnọgide ruo oge dị anya. 14Ka ndịisi anyị guzobe mkpọkọta niile. Ka ndị niile nọ nʼobodo anyị ndị lụrụ nwanyị site na mba ọzọ bịa nʼoge a kara aka, ha na ndị okenye na ndị ikpe nke obodo ọbụla, ruo mgbe oke iwe Chineke banyere okwu a sitere nʼebe anyị nọ pụọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.