Native Bible

Ezekiel 9:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nya akpa nke ihe e ji ede akwụkwọ dị nʼime ya, lọghachiri sị, “Arụchaala m ọrụ i nyere m ịrụ.”

Ezekiel 9:11 in English

Ezekiel 9:11 · Berean Standard Bible

Then the man clothed in linen with the writing kit at his side reported back, “I have done as You commanded.”

Context

9Ọ sịrị m, “Mmehie niile nke ụlọ Izrel na Juda dị ukwuu rie nne. Ala niile jupụtakwara nʼọbara ndị egburu, obodo jupụtakwara nʼikpe ikpe na-ezighị ezi. Nʼihi na ha na-asị, ‘Onyenwe anyị esitela nʼala anyị wezuga onwe ya. Ọ dịghị ihe Onyenwe anyị na-ahụ.’ 10Nʼihi ya, agaghị m ahapụ ha, agakwaghị m enwe ọmịiko nʼahụ ha. Aga m akwụghachi ha nʼihi ihe ọjọọ niile ha mere.” 11Mgbe ahụ, nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nya akpa nke ihe e ji ede akwụkwọ dị nʼime ya, lọghachiri sị, “Arụchaala m ọrụ i nyere m ịrụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.