Native Bible

Ezekiel 9:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, agaghị m ahapụ ha, agakwaghị m enwe ọmịiko nʼahụ ha. Aga m akwụghachi ha nʼihi ihe ọjọọ niile ha mere.”

Ezekiel 9:10 in English

Ezekiel 9:10 · Berean Standard Bible

But as for Me, I will not look on them with pity, nor will I spare them. I will bring their deeds down upon their own heads.”

Context

8Mgbe ha nọ na-egbu ndị mmadụ maọbụ naanị m fọdụrụ, adara m nʼala kpuchie ihu m, tie mkpu akwa, sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Ị ga-esite nʼoke iwe ị na-eweso Jerusalem bibie ihe niile fọdụrụ nʼIzrel?” 9Ọ sịrị m, “Mmehie niile nke ụlọ Izrel na Juda dị ukwuu rie nne. Ala niile jupụtakwara nʼọbara ndị egburu, obodo jupụtakwara nʼikpe ikpe na-ezighị ezi. Nʼihi na ha na-asị, ‘Onyenwe anyị esitela nʼala anyị wezuga onwe ya. Ọ dịghị ihe Onyenwe anyị na-ahụ.’ 10Nʼihi ya, agaghị m ahapụ ha, agakwaghị m enwe ọmịiko nʼahụ ha. Aga m akwụghachi ha nʼihi ihe ọjọọ niile ha mere.” 11Mgbe ahụ, nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nya akpa nke ihe e ji ede akwụkwọ dị nʼime ya, lọghachiri sị, “Arụchaala m ọrụ i nyere m ịrụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.