Native Bible

Ezekiel 48:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ruben ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ifrem, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.

Ezekiel 48:6 in English

Ezekiel 48:6 · Berean Standard Bible

Reuben will have one portion bordering the territory of Ephraim from east to west.

Context

4Manase nwere otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Naftalị, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. 5Ifrem ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Manase, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. 6Ruben ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ifrem, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. 7Juda ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ruben, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. 8“Ala nke ya na oke ala ndị Juda ga-agbatị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ka ị ga-enye dịka onyinye pụrụ iche. Obosara ya ga-abụ ihe dị kilomita iri na atọ. Ogologo ya site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ ga-aha ka ala otu ebo ketara. Ụlọnsọ ukwu ahụ ga-adịkwa nʼetiti ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.