Izikiel 47:8
Ezekiel 47:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị, “Iyi a na-asọ na-aga akụkụ ọwụwa anyanwụ, sọbanye nʼime Araba,* tutu bịa sọbanye nʼosimiri nnu ahụ. Mgbe ọ sọbanyere nʼosimiri nnu ahụ, mmiri ya na-aghọ mmiri dị mma ọṅụṅụ
Ezekiel 47:8 in English
Ezekiel 47:8 · Berean Standard Bible
And he said to me, “This water flows out to the eastern region and goes down into the Arabah. When it empties into the Sea,* the water there becomes fresh.*
Context
6Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụrụ ihe ndị a?”
O duuru m laghachi nʼọnụ mmiri. 7Mgbe m rutere nʼọnụ mmiri, lee, ahụrụ m ọtụtụ osisi nke toro nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ. 8Ọ sịrị, “Iyi a na-asọ na-aga akụkụ ọwụwa anyanwụ, sọbanye nʼime Araba,* tutu bịa sọbanye nʼosimiri nnu ahụ. Mgbe ọ sọbanyere nʼosimiri nnu ahụ, mmiri ya na-aghọ mmiri dị mma ọṅụṅụ 9Ọtụtụ ihe e kere eke dị ndụ ga-ebi nʼebe ọbụla mmiri a na-asọ aga. Azụ dị ukwuu ga-ejupụta nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri a na-asọbanye nʼebe ahụ, na-eme ka mmiri osimiri ghọọ mmiri dị mma ịṅụ aṅụ. Ya mere, ihe niile dị nʼebe ọbụla mmiri a sọjere ga-adị ndụ. 10Ndị ọkụ azụ ga-eguzo nʼọnụ mmiri, site nʼEn-Gedi ruo nʼEn-Eglaim a gaghị enweta ebe a na-agbasa ụgbụ e ji egbu azụ. Azụ dị iche iche ga-adịkwa, dịka azụ osimiri Mediterenịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.