Izikiel 45:9
Ezekiel 45:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: O zuolara unu, unu ụmụ ndị eze Izrel. Kwụsịnụ ịpụnara ndị m ihe ha nwere nʼike, kpeenụ ikpe ziri ezi na-emekwa ihe kwesiri ekwesi. Kwụsịnụ ịchụpụ ndị m site nʼihe ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
Ezekiel 45:9 in English
Ezekiel 45:9 · Berean Standard Bible
For this is what the Lord GOD says: ‘Enough, O princes of Israel! Cease your violence and oppression, and do what is just and right. Stop dispossessing My people, declares the Lord GOD.’
Context
7“ ‘A ga-ewepụta ala pụrụ iche maka nwa eze. Ala a ga-adị nʼakụkụ abụọ nke ala nsọ ahụ, na obodo ahụ. Ala a ga-agbatịrị site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ebe oke ya dị ruo nʼosimiri Mediterenịa. Ọ ga-esitekwa nʼoke ala ya nʼọwụwa anyanwụ gbatịrị ruo nʼebe ebo Izrel nwere ala ha. Nʼụzọ dị otu a, ala a ga-aha ka ala ebo Izrel ketara. 8Ala a ga-abụrụ ya ihe nketa nʼIzrel. Ndịisi m agaghị emegbu ndị m ọzọ, ma ha ga-ahapụ ndị Izrel ka ha keta ala ndị a dịka ebo niile ha si dị. 9“ ‘Nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: O zuolara unu, unu ụmụ ndị eze Izrel. Kwụsịnụ ịpụnara ndị m ihe ha nwere nʼike, kpeenụ ikpe ziri ezi na-emekwa ihe kwesiri ekwesi. Kwụsịnụ ịchụpụ ndị m site nʼihe ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. 10Ka ihe ọtụtụ unu ji ere ahịa unu bụrụ ezigbo efa na ezigbo baf* nke a na-ejighị aghụghọ kpụọ. 11Ka ihe ọtụtụ homa bụrụ ihe unu ga-eji na-atụ ihe niile, ma mmanụ, ma ọka. Ihe ọtụtụ ndị ọzọ unu ga-enwe ga-abụ efa, nke bụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke homa, maka ịtụ ihe dịka ọka. Nke ọzọ bụ baf, nke bụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke homa, maka ịtụ ihe dịka mmanụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.