Izikiel 45:8
Ezekiel 45:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ala a ga-abụrụ ya ihe nketa nʼIzrel. Ndịisi m agaghị emegbu ndị m ọzọ, ma ha ga-ahapụ ndị Izrel ka ha keta ala ndị a dịka ebo niile ha si dị.
Ezekiel 45:8 in English
Ezekiel 45:8 · Berean Standard Bible
This land will be his possession in Israel. And My princes will no longer oppress My people, but will give the rest of the land to the house of Israel according to their tribes.
Context
6“ ‘Nʼakụkụ obodo nsọ ka a ga-ekewapụta ala nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dịkwa kilomita abụọ na ọkara, nke a ga-abụ nke ndị Izrel. 7“ ‘A ga-ewepụta ala pụrụ iche maka nwa eze. Ala a ga-adị nʼakụkụ abụọ nke ala nsọ ahụ, na obodo ahụ. Ala a ga-agbatịrị site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ebe oke ya dị ruo nʼosimiri Mediterenịa. Ọ ga-esitekwa nʼoke ala ya nʼọwụwa anyanwụ gbatịrị ruo nʼebe ebo Izrel nwere ala ha. Nʼụzọ dị otu a, ala a ga-aha ka ala ebo Izrel ketara. 8Ala a ga-abụrụ ya ihe nketa nʼIzrel. Ndịisi m agaghị emegbu ndị m ọzọ, ma ha ga-ahapụ ndị Izrel ka ha keta ala ndị a dịka ebo niile ha si dị. 9“ ‘Nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: O zuolara unu, unu ụmụ ndị eze Izrel. Kwụsịnụ ịpụnara ndị m ihe ha nwere nʼike, kpeenụ ikpe ziri ezi na-emekwa ihe kwesiri ekwesi. Kwụsịnụ ịchụpụ ndị m site nʼihe ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. 10Ka ihe ọtụtụ unu ji ere ahịa unu bụrụ ezigbo efa na ezigbo baf* nke a na-ejighị aghụghọ kpụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.