Native Bible

Ezekiel 45:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-abụ oke ala ndị nchụaja, ndị na-eje ozi nʼebe nsọ, na ndị na-abịa nso ije ozi nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-abụkwa ebe ụlọ obibi ha ga-adị, bụrụkwa ebe dị nsọ maka ebe nsọ ahụ.

Ezekiel 45:4 in English

Ezekiel 45:4 · Berean Standard Bible

It will be a holy portion of the land to be used by the priests who minister in the sanctuary, who draw near to minister before the LORD. It will be a place for their houses, as well as a holy area for the sanctuary.

Context

2Site nʼala, otu akụkụ dị narị mita abụọ na iri itoolu na otu, na iri sentimita asaa na ise, ga-abụ maka ebe nsọ. A ga-ahapụ ala dị iri mita abụọ na itoolu gburugburu ya. 3Site nʼoke ebe ahụ dị nsọ, tụpụta oke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, obosara ya kilomita ise na ọkara. Ọ bụ nʼime ya ka ebe nsọ, ya bụ Ebe ahụ Kachasị Nsọ ga-adị. 4Ọ ga-abụ oke ala ndị nchụaja, ndị na-eje ozi nʼebe nsọ, na ndị na-abịa nso ije ozi nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-abụkwa ebe ụlọ obibi ha ga-adị, bụrụkwa ebe dị nsọ maka ebe nsọ ahụ. 5Ala ọzọ dị ya nʼakụkụ, nke ga-adị kilomita iri na atọ nʼogologo, kilomita ise na ọkara nʼobosara ya, ga-abụ ebe obibi ndị Livayị, ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwuu ahụ. 6“ ‘Nʼakụkụ obodo nsọ ka a ga-ekewapụta ala nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dịkwa kilomita abụọ na ọkara, nke a ga-abụ nke ndị Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.