Izikiel 45:2
Ezekiel 45:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Site nʼala, otu akụkụ dị narị mita abụọ na iri itoolu na otu, na iri sentimita asaa na ise, ga-abụ maka ebe nsọ. A ga-ahapụ ala dị iri mita abụọ na itoolu gburugburu ya.
Ezekiel 45:2 in English
Ezekiel 45:2 · Berean Standard Bible
Within this area there is to be a section for the sanctuary 500 cubits square,* with 50 cubits * around it for open land.
Context
1“ ‘Mgbe unu ga-eke ala ahụ dịka ihe nketa, unu ga-ebu ụzọ nye Onyenwe anyị otu oke nʼime ya ka ọ bụrụ oke dị nsọ nke ala ahụ. Ogologo ya ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita iri na otu. Ihe dị nsọ ka ala ahụ niile ga-abụ gbaa gburugburu. 2Site nʼala, otu akụkụ dị narị mita abụọ na iri itoolu na otu, na iri sentimita asaa na ise, ga-abụ maka ebe nsọ. A ga-ahapụ ala dị iri mita abụọ na itoolu gburugburu ya. 3Site nʼoke ebe ahụ dị nsọ, tụpụta oke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, obosara ya kilomita ise na ọkara. Ọ bụ nʼime ya ka ebe nsọ, ya bụ Ebe ahụ Kachasị Nsọ ga-adị. 4Ọ ga-abụ oke ala ndị nchụaja, ndị na-eje ozi nʼebe nsọ, na ndị na-abịa nso ije ozi nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-abụkwa ebe ụlọ obibi ha ga-adị, bụrụkwa ebe dị nsọ maka ebe nsọ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.