Izikiel 42:4
Ezekiel 42:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihu ọnụụlọ ndị a, e nwere ka ụzọ njegharị nke dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo. Ọnụ ụzọ ha niile chere ihu nʼugwu.
Ezekiel 42:4 in English
Ezekiel 42:4 · Berean Standard Bible
In front of the chambers was an inner walkway ten cubits wide and a hundred cubits long.* Their doors were on the north.
Context
2Ụlọ ahụ nke ọnụ ụzọ ya chere ihu nʼebe ugwu dị iri mita ise na atọ nʼogologo, ebe obosara ya dị iri mita abụọ na asaa. 3Ma nʼakụkụ nke dị iri mita na otu, site nʼime ogige nakwa nʼakụkụ nke dị na ncherita ihu pevumentị nke ogige dị nʼezi, ebe njegharị chere ebe njegharị ọzọ ihu, nʼokpukpu atọ ahụ. 4Nʼihu ọnụụlọ ndị a, e nwere ka ụzọ njegharị nke dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo. Ọnụ ụzọ ha niile chere ihu nʼugwu. 5Okpukpu ụlọ nke dị nʼelu asaghị mbara dịka nke dị nʼala, nʼihi na ebe njegharị ndị ahụ weere ọtụtụ oghere karịa ka ọ dị nʼọnụụlọ ndị dị okpukpu nke dị nʼala na nke etiti ụlọ ahụ. 6Ebe a na-ejighị ogidi wuo ụlọ a, dịka e si wuo ndị dị nʼogige, nke a mere ka ụlọ ndị dị nʼelu na-akpa nkpa karịa ndị nke dị nʼala, na ndị dị nʼetiti.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.