Native Bible

Ezekiel 42:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nʼakụkụ nke dị iri mita na otu, site nʼime ogige nakwa nʼakụkụ nke dị na ncherita ihu pevumentị nke ogige dị nʼezi, ebe njegharị chere ebe njegharị ọzọ ihu, nʼokpukpu atọ ahụ.

Ezekiel 42:3 in English

Ezekiel 42:3 · Berean Standard Bible

Gallery faced gallery in three levels opposite the twenty cubits * that belonged to the inner court and opposite the pavement that belonged to the outer court.

Context

1Nwoke ahụ duuru m gaa nʼakụkụ ugwu, banye nʼime ogige ahụ dị nʼezi, kpọbata m nʼime ọnụụlọ ndị ahụ dị na ncherita ihu nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ. 2Ụlọ ahụ nke ọnụ ụzọ ya chere ihu nʼebe ugwu dị iri mita ise na atọ nʼogologo, ebe obosara ya dị iri mita abụọ na asaa. 3Ma nʼakụkụ nke dị iri mita na otu, site nʼime ogige nakwa nʼakụkụ nke dị na ncherita ihu pevumentị nke ogige dị nʼezi, ebe njegharị chere ebe njegharị ọzọ ihu, nʼokpukpu atọ ahụ. 4Nʼihu ọnụụlọ ndị a, e nwere ka ụzọ njegharị nke dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo. Ọnụ ụzọ ha niile chere ihu nʼugwu. 5Okpukpu ụlọ nke dị nʼelu asaghị mbara dịka nke dị nʼala, nʼihi na ebe njegharị ndị ahụ weere ọtụtụ oghere karịa ka ọ dị nʼọnụụlọ ndị dị okpukpu nke dị nʼala na nke etiti ụlọ ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.