Izikiel 39:9
Ezekiel 39:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Nʼoge ahụ, ndị bi nʼobodo niile nke Izrel ga-apụ tụtụkọtaa ngwa agha ndị ahụ, were fụnwue ọkụ, surekwaa ha ọkụ, ma ọta ukwu ma ọta nta niile, ụta na àkụ niile, ma mkpọ agha na ùbe niile. Ọ bụ afọ asaa ka ha ga-eji ha mere nkụ.
Ezekiel 39:9 in English
Ezekiel 39:9 · Berean Standard Bible
Then those who dwell in the cities of Israel will go out, kindle fires, and burn up the weapons—the bucklers and shields, the bows and arrows, the clubs and spears. For seven years they will use them for fuel.
Context
7“ ‘Aga m eme ka amara aha nsọ m nʼetiti ndị m bụ Izrel. Agaghị m ekwekwa ka e lelịa aha nsọ m anya ọzọ.* Mba niile dị iche iche ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nọ nʼIzrel. 8Lee, ọ na-abịa, nʼezie, ọ ga-emekwa, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. Nke a bụ ụbọchị ahụ nke m kwuru ihe banyere ya. 9“ ‘Nʼoge ahụ, ndị bi nʼobodo niile nke Izrel ga-apụ tụtụkọtaa ngwa agha ndị ahụ, were fụnwue ọkụ, surekwaa ha ọkụ, ma ọta ukwu ma ọta nta niile, ụta na àkụ niile, ma mkpọ agha na ùbe niile. Ọ bụ afọ asaa ka ha ga-eji ha mere nkụ. 10Ha agaghị akpatakwa nkụ site nʼọhịa ọzọ, maọbụ gbuta ha site nʼoke ọhịa, nʼihi na ha ga-eji ngwa agha ndị a mere ihe ịfụnwu ọkụ. Mgbe ahụ, ha ga-akwata ihe onwunwe nke ndị ahụ kwakọrọ ihe onwunwe ha nʼagha, lụtakwa ihe onwunwe nke ndị ahụ lụnara ha ihe onwunwe ha nʼike. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 11“ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m enye Gog ebe olili ya nʼIzrel, nʼime ndagwurugwu si ọwụwa anyanwụ gawa nʼụzọ oke osimiri. Ọ ga-anọchi ụzọ ndị ije nʼihi na ebe ahụ ka a ga-eli Gog na usuu ndị agha ya. Ya mere, a ga-akpọ ya Ndagwurugwu Hamọn Gog.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.