Native Bible

Ezekiel 39:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Aga m eme ka amara aha nsọ m nʼetiti ndị m bụ Izrel. Agaghị m ekwekwa ka e lelịa aha nsọ m anya ọzọ.* Mba niile dị iche iche ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nọ nʼIzrel.

Ezekiel 39:7 in English

Ezekiel 39:7 · Berean Standard Bible

So I will make My holy name known among My people Israel and will no longer allow it to be profaned. Then the nations will know that I am the LORD, the Holy One in Israel.

Context

5Ị ga-ada nʼọhịa na-enweghị ebe nzobe, nʼihi na m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 6Aga m awụkwasị ọkụ nʼahụ Magog, na nʼahụ ndị ahụ niile bi nʼudo, nʼọnụ mmiri niile. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 7“ ‘Aga m eme ka amara aha nsọ m nʼetiti ndị m bụ Izrel. Agaghị m ekwekwa ka e lelịa aha nsọ m anya ọzọ.* Mba niile dị iche iche ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nọ nʼIzrel. 8Lee, ọ na-abịa, nʼezie, ọ ga-emekwa, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. Nke a bụ ụbọchị ahụ nke m kwuru ihe banyere ya. 9“ ‘Nʼoge ahụ, ndị bi nʼobodo niile nke Izrel ga-apụ tụtụkọtaa ngwa agha ndị ahụ, were fụnwue ọkụ, surekwaa ha ọkụ, ma ọta ukwu ma ọta nta niile, ụta na àkụ niile, ma mkpọ agha na ùbe niile. Ọ bụ afọ asaa ka ha ga-eji ha mere nkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.