Izikiel 38:10
Ezekiel 38:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ, echiche ọjọọ ga-abata nʼobi gị, mgbe ị na-atule ọtụtụ ihe dị iche iche nʼobi gị.
Ezekiel 38:10 in English
Ezekiel 38:10 · Berean Standard Bible
This is what the Lord GOD says: On that day, thoughts will arise in your mind, and you will devise an evil plan.
Context
8Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, a ga-akpọlite gị ibu agha. Nʼogologo oge dị nʼihu, ị ga-ebuso ala ahụ agha bụ ala ahụ na-enwetaghachi onwe ya site na mbibi nke ibu agha; ala ahụ e si na mba dị iche iche chịkọtaa ndị bi nʼime ya, mee ka ha birikwa nʼugwu niile nke Izrel ahụ naara atọgbọ nʼefu. E bulatara ha site na mba dị iche iche, ma ugbu a, ha anọrọla nʼudo. 9Gị onwe gị, na ndị agha gị niile, na ọtụtụ ndị mba ahụ dị iche iche ndị na-eso gị, jiri ọsọ, dịka ikuku siri ike, rigoo, kpuchie ala ahụ dịka igwe ojii. 10“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ, echiche ọjọọ ga-abata nʼobi gị, mgbe ị na-atule ọtụtụ ihe dị iche iche nʼobi gị. 11Ị ga-asị, “Aga m ebuli megide nʼala na-enweghị mgbidi, aga m awakpo ndị nọ nʼudo na-adịghị atụ anya nsogbu ọbụla, ha niile bụ ndị bi nʼebe na-enweghị mgbidi, ha enweghịkwa ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha. 12Aga m akwata ihe nkwata, lụtakwa ihe nlụta nʼagha. Aga m eweli aka m megide obodo ndị a niile e wugharịrị ewugharị, megidekwa ndị a niile e si na mba dị iche iche chịkọtaa, bụ ndị bara ọgaranya nʼanụ ụlọ na ngwongwo dị iche iche, ndị bikwa nʼetiti ala a.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.