Izikiel 32:31
Ezekiel 32:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Fero na ndị agha ya niile ga-ahụ ndị a, ọ ga-enwe nkasiobi maka ndị ya niile, na usuu ndị agha ya niile ndị eji mma agha gbuo. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
Ezekiel 32:31 in English
Ezekiel 32:31 · Berean Standard Bible
Pharaoh will see them and be comforted over all his multitude— Pharaoh and all his army, slain by the sword, declares the Lord GOD.
Context
29“Nʼebe ahụ ka Edọm na ndị eze ya, na ndịisi ya niile nọ. Nʼagbanyeghị ịdị ike ha, ha na ndị e ji mma agha gbuo tọgbọrọ nʼebe ahụ. Ha na ndị a na-ebighị ugwu so dinaa, bụ ndị na-arịdaru nʼolulu. 30“Ndịisi nke mba ndị ugwu, na ndị Saịdọn niile nọ nʼebe ahụ. Ụjọ niile nke ha sitere nʼisiike ha menye ndị mmadụ egbochighị ha iketa oke nʼihere nke iso ndị e gburu egbu nwụọ. Ha soro ndị eji mma agha gbuo dinaa na-ebighị ugwu, buru ihere ha, ha na-arịdaru nʼolulu. 31“Fero na ndị agha ya niile ga-ahụ ndị a, ọ ga-enwe nkasiobi maka ndị ya niile, na usuu ndị agha ya niile ndị eji mma agha gbuo. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. 32Nʼagbanyeghị na emeela m ka ọ gbasaa ụjọ* nʼala ndị dị ndụ, Fero na igwe mmadụ a niile ka a ga-eli nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, ya na ndị ejiri mma agha gbuo. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
32:10 Nwee akpata oyi nʼebe ị nọ
32:10 Nke a bụ nʼihi egwu
32:27 Eleghị anya ihe a ga-agụta nʼakwụkwọ Hibru; ya bụ akwụkwọ Masoreti ga-abụ ntaramahụhụ ha dịkwasịrị nʼọkpụkpụ ha
32:32 Maọbụ, ka ụjọ ya dị
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.