Izikiel 32:30
Ezekiel 32:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ndịisi nke mba ndị ugwu, na ndị Saịdọn niile nọ nʼebe ahụ. Ụjọ niile nke ha sitere nʼisiike ha menye ndị mmadụ egbochighị ha iketa oke nʼihere nke iso ndị e gburu egbu nwụọ. Ha soro ndị eji mma agha gbuo dinaa na-ebighị ugwu, buru ihere ha, ha na-arịdaru nʼolulu.
Ezekiel 32:30 in English
Ezekiel 32:30 · Berean Standard Bible
All the leaders of the north and all the Sidonians are there; they went down in disgrace with the slain, despite the terror of their might. They lie uncircumcised with those slain by the sword and bear their shame with those who descend to the Pit.
Context
28“Ma gị onwe gị, bụ Fero, otu a ka a ga-esi gbajie gị, ị ga-edinakwa nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị e ji mma agha gbuo. 29“Nʼebe ahụ ka Edọm na ndị eze ya, na ndịisi ya niile nọ. Nʼagbanyeghị ịdị ike ha, ha na ndị e ji mma agha gbuo tọgbọrọ nʼebe ahụ. Ha na ndị a na-ebighị ugwu so dinaa, bụ ndị na-arịdaru nʼolulu. 30“Ndịisi nke mba ndị ugwu, na ndị Saịdọn niile nọ nʼebe ahụ. Ụjọ niile nke ha sitere nʼisiike ha menye ndị mmadụ egbochighị ha iketa oke nʼihere nke iso ndị e gburu egbu nwụọ. Ha soro ndị eji mma agha gbuo dinaa na-ebighị ugwu, buru ihere ha, ha na-arịdaru nʼolulu. 31“Fero na ndị agha ya niile ga-ahụ ndị a, ọ ga-enwe nkasiobi maka ndị ya niile, na usuu ndị agha ya niile ndị eji mma agha gbuo. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. 32Nʼagbanyeghị na emeela m ka ọ gbasaa ụjọ* nʼala ndị dị ndụ, Fero na igwe mmadụ a niile ka a ga-eli nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, ya na ndị ejiri mma agha gbuo. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
32:10 Nwee akpata oyi nʼebe ị nọ
32:10 Nke a bụ nʼihi egwu
32:27 Eleghị anya ihe a ga-agụta nʼakwụkwọ Hibru; ya bụ akwụkwọ Masoreti ga-abụ ntaramahụhụ ha dịkwasịrị nʼọkpụkpụ ha
32:32 Maọbụ, ka ụjọ ya dị
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.