Izikiel 30:23
Ezekiel 30:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile,
Ezekiel 30:23 in English
Ezekiel 30:23 · Berean Standard Bible
I will disperse the Egyptians among the nations and scatter them throughout the lands.
Context
21“Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha. 22Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ. 23Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile, 24meekwa ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike. Aga m etinye mma agha m nʼaka ya, ma ogwe aka abụọ nke Fero ka m ga-agbajisi. Mgbe ahụ, Fero ga-asụ ude nʼihu eze Babilọn dịka onye e merụrụ ahụ. 25Aga m eme ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike; ma ogwe aka Fero ga-akpọnwụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyere mma agha nʼaka eze Babilọn, na mgbe o setịpụrụ ya imegide Ijipt.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.