Native Bible

Ezekiel 3:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aka Onyenwe anyị dịgidesịrị ike nʼahụ m nʼebe ahụ. Ma ọ sịrị m, “Bilie gaa nʼebe ahụ obosara ala dị ka m gwa gị okwu nʼebe ahụ,”

Ezekiel 3:22 in English

Ezekiel 3:22 · Berean Standard Bible

And there the hand of the LORD was upon me, and He said to me, “Get up, go out to the plain, and there I will speak with you.”

Context

20“Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼụzọ ezi omume ya wezuga onwe ya bido ime ihe ọjọọ, m siere ha ọnya,* ha ga-anwụ nʼihi na ị dọghị ha aka na ntị, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha. Agaghịkwa echeta ihe ọma niile ndị ha mere, ma ị ga-aza ajụjụ maka ọnwụ ha. 21Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ezi omume aka na ntị ka ọ ghara ime mmehie, ha gharakwa ime mmehie, ha ga-adị ndụ nʼihi na ha nabatara ịdọ aka na ntị ahụ. Gị onwe gị azọpụtakwala ndụ gị, nʼụzọ dị otu a.” 22Aka Onyenwe anyị dịgidesịrị ike nʼahụ m nʼebe ahụ. Ma ọ sịrị m, “Bilie gaa nʼebe ahụ obosara ala dị ka m gwa gị okwu nʼebe ahụ,” 23Ebiliri m gaa nʼebe ahụ ala dị larịị. Ebube Onyenwe anyị guzo nʼebe ahụ dịka ebube nke m hụrụ nʼakụkụ iyi Keba. Adara m kpuo ihu m nʼala. 24Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ banyere nʼime m mee ka m guzo ọtọ nʼụkwụ m abụọ. Ọ gwara m okwu sị m, “Gaa, baa nʼụlọ, mechibido onwe gị ụzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.