Izikiel 3:20
Ezekiel 3:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼụzọ ezi omume ya wezuga onwe ya bido ime ihe ọjọọ, m siere ha ọnya,* ha ga-anwụ nʼihi na ị dọghị ha aka na ntị, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha. Agaghịkwa echeta ihe ọma niile ndị ha mere, ma ị ga-aza ajụjụ maka ọnwụ ha.
Ezekiel 3:20 in English
Ezekiel 3:20 · Berean Standard Bible
Now if a righteous man turns from his righteousness and commits iniquity, and I put a stumbling block before him, he will die. If you did not warn him, he will die in his sin,* and the righteous acts he did will not be remembered. And I will hold you responsible for his blood.
Context
18Mgbe m na-asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma ọ bụrụ na ị dọghị ya aka na ntị, maọbụ ị kwughị okwu ime ka ha chigharịa site nʼụzọ ọjọọ ha niile pụta nʼihi ịzọpụta ndụ ha, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha. 19Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị, ma ha esighị nʼajọ omume maọbụ nʼụzọ ọjọọ ha niile chigharịa, ha ga-anwụ nʼihi mmehie, ma ndụ gị ka ị zọpụtara. 20“Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼụzọ ezi omume ya wezuga onwe ya bido ime ihe ọjọọ, m siere ha ọnya,* ha ga-anwụ nʼihi na ị dọghị ha aka na ntị, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha. Agaghịkwa echeta ihe ọma niile ndị ha mere, ma ị ga-aza ajụjụ maka ọnwụ ha. 21Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ezi omume aka na ntị ka ọ ghara ime mmehie, ha gharakwa ime mmehie, ha ga-adị ndụ nʼihi na ha nabatara ịdọ aka na ntị ahụ. Gị onwe gị azọpụtakwala ndụ gị, nʼụzọ dị otu a.” 22Aka Onyenwe anyị dịgidesịrị ike nʼahụ m nʼebe ahụ. Ma ọ sịrị m, “Bilie gaa nʼebe ahụ obosara ala dị ka m gwa gị okwu nʼebe ahụ,”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.