Native Bible

Ezekiel 29:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dịghị ụkwụ anụmanụ maọbụ mmadụ ga-agafe nʼime ya, agaghị ebikwa nʼime ya ruo mgbe iri afọ anọ gasịrị.

Ezekiel 29:11 in English

Ezekiel 29:11 · Berean Standard Bible

No foot of man or beast will pass through, and it will be uninhabited for forty years.

Context

9Ala Ijipt ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu; ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. “ ‘Nʼihi na ị sịrị, “Osimiri Naịl bụ nke m. Ọ bụ m kere ya.” 10Nʼihi ya, aga m edo onwe m megide gị, megidekwa osimiri gị. Aga m ala Ijipt niile nʼiyi site na Migdol ruo Aswan, ruokwa nʼoke ala ha na ndị Kush.* 11Ọ dịghị ụkwụ anụmanụ maọbụ mmadụ ga-agafe nʼime ya, agaghị ebikwa nʼime ya ruo mgbe iri afọ anọ gasịrị. 12Aga m emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mkpọmkpọ ala niile, obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu iri afọ anọ nʼetiti obodo ndị e mere ka ha laa nʼiyi. Aga m achụsasị ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. 13“ ‘Ọzọkwa, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼọgwụgwụ iri afọ anọ ahụ, aga m achịkọtakwa ndị Ijipt site nʼebe niile ha gbasara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.