Native Bible

Ezekiel 25:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼala ụmụ Amọn buo amụma megide ha.

Ezekiel 25:2 in English

Ezekiel 25:2 · Berean Standard Bible

“Son of man, set your face against the Ammonites and prophesy against them.

Context

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼala ụmụ Amọn buo amụma megide ha. 3Gwa ndị Amọn, ‘Nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na ị sịrị “Aha!” megide ebe nsọ m mgbe e merụrụ ya na megide ala Izrel, mgbe e mere ka ọ tọgbọrọ nʼefu, na mgbe a dọtara ndị Juda nʼagha duru ha gaa mba ọzọ dịka ohu, 4nʼihi ya, aga m ewere gị nyefee nʼaka ndị si nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ị bụrụ ihe nketa ha. Ha ga-ewu ebe obibi nʼetiti gị, rie mkpụrụ ubi gị, ṅụọkwa mmiri ara ehi gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.