Native Bible

Ezekiel 25:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m ata Moab ahụhụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”

Ezekiel 25:11 in English

Ezekiel 25:11 · Berean Standard Bible

So I will execute judgments on Moab, and they will know that I am the LORD.’

Context

9nʼihi nke a, aga m emeghe akụkụ Moab, site nʼobodo nke nsọtụ oke ala ya niile, bụ Bet-Jeshimọt, Baal-Meon na Kiriatem, nke bụ ebube nke ala ahụ. 10Aga m ewere Moab na Amọn nyefee ha nʼaka ndị ga-esi nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ọ bụrụ nke ha. Nʼụzọ dị otu a, a gaghị agụkwa maọbụ cheta Amọn nʼetiti mba niile. 11Aga m ata Moab ahụhụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ” 12“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na Edọm bọọrọ onwe ha ọbọ megide ụlọ Juda sitekwa nʼịbọ ọbọ ha bụrụ ndị ikpe mara, 13nʼihi nke a, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m esetipụ aka m megide Edọm, gbuo ndị bi nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ. Aga m eme ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ndị niile bi nʼala ahụ site na Teman ruo na Dedan ka a ga-eji mma agha gbuo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.