Izikiel 23:48
Ezekiel 23:48 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Otu a, aga m eme ka ibi ndụ ọjọọ kwụsị nʼala ahụ, ka esi otu a adọ ndị inyom niile aka na ntị, ka ha hapụ ịgbaso nzọ ụkwụ gị.
Ezekiel 23:48 in English
Ezekiel 23:48 · Berean Standard Bible
So I will put an end to indecency in the land, and all the women will be admonished not to imitate your behavior.
Context
46“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m akpọkọta igwe ndị mmadụ ga-emegide ha, nyefee ha nʼaka oke ihe egwu, nakwa ihe nlụta nʼagha. 47Mkpọkọta mmadụ ahụ ga-atụ ha nkume, werekwa mma agha gbudasịa ha. Ha ga-egbu ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom, kpọkwaa ụlọ ha niile ọkụ. 48“Otu a, aga m eme ka ibi ndụ ọjọọ kwụsị nʼala ahụ, ka esi otu a adọ ndị inyom niile aka na ntị, ka ha hapụ ịgbaso nzọ ụkwụ gị. 49Ị ghaghị ịta ahụhụ nʼihi ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị, hụkwaa ahụhụ nʼihi mmehie niile nke ịkpọ isiala nye arụsị. Mgbe ahụ ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.”
23:15 Maọbụ, belịt
23:22 Ndị ahụ hụrụ gị nʼanya ya bụ ndị iko ya
23:31 Aga m ata gị ahụhụ dịka m si taa ya.
23:34 Maọbụ, ejuju
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.