Izikiel 23:38
Ezekiel 23:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ọzọ ha mere m bụ nke a: Ha merụrụ ebe nsọ m nʼotu ụbọchị ahụ ha mere ka ụbọchị izuike m gharakwa ịdị nsọ.
Ezekiel 23:38 in English
Ezekiel 23:38 · Berean Standard Bible
They have also done this to Me: On that very same day, they defiled My sanctuary and profaned My Sabbaths.
Context
36Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe Ohola na Oholiba ikpe? Mgbe ahụ, guzogide ha mee ka ha mara ihe arụ niile ha na-eme. 37Nʼihi na ha akwaala iko, ọbara jupụtakwara nʼaka ha, ha na arụsị ha kwakwara iko. Ha jikwa ọ bụladị ụmụ nke ha mụtaara m chụọ aja nsure ọkụ nye ha. 38Ihe ọzọ ha mere m bụ nke a: Ha merụrụ ebe nsọ m nʼotu ụbọchị ahụ ha mere ka ụbọchị izuike m gharakwa ịdị nsọ. 39Nʼihi na nʼotu ụbọchị ahụ ha ji ụmụ ha chụọ aja nye arụsị ha, bụkwa ụbọchị ha batara nʼụlọnsọ m merụọ ya. Ihe dị otu a ka ha mere nʼụlọnsọ m. 40“Ọ bụghị naanị nke a, ha zigara ndị ozi ịkpọ ndị ikom na-esi ebe dị anya bịa, mgbe ha bịara, nʼihi ha, ị sachara ahụ gị nke ọma, tee ihe nʼanya gị, yirikwa ezigbo ihe ịchọ mma gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.