Izikiel 23:26
Ezekiel 23:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-eyipụ gị uwe ọma gị niile, chikọrọ ihe ịchọ mma gị niile.
Ezekiel 23:26 in English
Ezekiel 23:26 · Berean Standard Bible
They will strip off your clothes and take your fine jewelry.
Context
24Ha ga-eji ngwa agha dị iche iche, ụgbọala nke agha na ọtụtụ igwe ndị mmadụ dị iche iche; ha ji ọta ukwu na ọta nta, kpurukwa okpu agha igwe, were ọnọdụ gburugburu gị nʼakụkụ ọbụla, imegide gị. Aga m enyefe gị nʼaka ha, ka ha taa gị ahụhụ, ha ga-atakwa gị ahụhụ dịka usoro ikpe ha si dị. 25Aga m edo ekworo nke iwe m megide gị, ha ga-eji iwe na ọnụma mesie gị ike. Ha ga-ebipụ imi unu na ntị unu, ndị fọdụkwara nʼime unu ga-anwụ site na mma agha. Ha ga-achịkọrọ ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom pụọ, unu ndị nke fọdụrụ ka ọkụ ga-erepịa. 26Ha ga-eyipụ gị uwe ọma gị niile, chikọrọ ihe ịchọ mma gị niile. 27Nʼụzọ dị otu a, a ga-eme ka agụ ọchịchọ ọjọọ nke anụahụ na ịkwa iko, bụ nke i bidoro nʼala Ijipt kwụsị. Ị gaghị enwekwa agụụ ile ihe ndị a niile anya maọbụ chetakwa Ijipt nʼuche gị. 28“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m aga iwere gị nyefee nʼaka ndị ahụ kpọrọ gị asị, bụ ndị ahụ ị wezugara onwe gị site nʼebe ha nọ nʼihi ịsọ oyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.