Izikiel 23:24
Ezekiel 23:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-eji ngwa agha dị iche iche, ụgbọala nke agha na ọtụtụ igwe ndị mmadụ dị iche iche; ha ji ọta ukwu na ọta nta, kpurukwa okpu agha igwe, were ọnọdụ gburugburu gị nʼakụkụ ọbụla, imegide gị. Aga m enyefe gị nʼaka ha, ka ha taa gị ahụhụ, ha ga-atakwa gị ahụhụ dịka usoro ikpe ha si dị.
Ezekiel 23:24 in English
Ezekiel 23:24 · Berean Standard Bible
They will come against you with a host of peoples,* with weapons, chariots, and wagons. They will array themselves against you on every side with buckler and shield and helmet. I will delegate judgment to them, and they will punish you according to their own standards.
Context
22“Nʼihi nke a, gị Oholiba, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m akpali ndị ahụ hụrụ gị nʼanya* megide gị, bụ ndị ahụ ihe ha na-amasịkwaghị gị ọzọ. Aga m esi nʼakụkụ niile kpọta ha, megide gị. 23Ndị Babilọn, ndị Kaldịa niile, ndị ikom Pekod, ndị Shoa, na ndị Koa, na ndị Asịrịa niile ha na ha soo. Ụmụ okorobịa niile dị mma ile anya, ha niile bụ ndị na-achị achị na ndị ọchịagha, ndịisi na-agba ịnyịnya, na ndị ikom ọkwa ha dị elu, ha niile ga-anọkwasị nʼelu ịnyịnya. 24Ha ga-eji ngwa agha dị iche iche, ụgbọala nke agha na ọtụtụ igwe ndị mmadụ dị iche iche; ha ji ọta ukwu na ọta nta, kpurukwa okpu agha igwe, were ọnọdụ gburugburu gị nʼakụkụ ọbụla, imegide gị. Aga m enyefe gị nʼaka ha, ka ha taa gị ahụhụ, ha ga-atakwa gị ahụhụ dịka usoro ikpe ha si dị. 25Aga m edo ekworo nke iwe m megide gị, ha ga-eji iwe na ọnụma mesie gị ike. Ha ga-ebipụ imi unu na ntị unu, ndị fọdụkwara nʼime unu ga-anwụ site na mma agha. Ha ga-achịkọrọ ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom pụọ, unu ndị nke fọdụrụ ka ọkụ ga-erepịa. 26Ha ga-eyipụ gị uwe ọma gị niile, chikọrọ ihe ịchọ mma gị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.