Native Bible

Ezekiel 23:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ahụrụ m na ya onwe ya merụkwara onwe ya; ha abụọ si otu ụzọ aga.

Ezekiel 23:13 in English

Ezekiel 23:13 · Berean Standard Bible

And I saw that she too had defiled herself; both of them had taken the same path.

Context

11“Oholiba bụ nwanne ya nwanyị hụrụ ihe ndị a, ma nʼime agụụ ihe ọjọọ nke gụrụ ya nakwa ịgba akwụna, ọ kpara agwa jọrọ njọ karịa nke nwanne ya nwanyị. 12Ya onwe ya kwa, agụụ ụmụ Asịrịa gụrụ ya, bụ ndịisi ọchịchị, na ndị ọchịagha, ndị dike nʼagha yi uwe agha dịka o kwesiri, ndị ikom na-amakwasị nʼelu ịnyịnya, ha niile bụ ụmụ okorobịa dị mma nʼile anya. 13Ahụrụ m na ya onwe ya merụkwara onwe ya; ha abụọ si otu ụzọ aga. 14“O gara nʼihu tụkwasị ihe nʼịgba akwụna ya karịa. Ọ hụrụ onyinyo ndị ikom atụnyere nʼahụ aja, bụ onyinyo nke ndị Kaldịa e ji ihe chara uhie uhie sepụta, 15ha kere ihe okike* nʼukwu ha nakwa akwa okike nʼisi ha; nʼile anya ha niile dịka ndịisi ụgbọ agha ndị Babilọn, Kaldịa bụ ala amụrụ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.