Izikiel 22:8
Ezekiel 22:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I lelịala ihe nsọ m niile, merụọkwa ụbọchị izuike m niile.
Ezekiel 22:8 in English
Ezekiel 22:8 · Berean Standard Bible
You have despised My holy things and profaned My Sabbaths.
Context
6“ ‘Lee ka ndịisi Izrel nọ nʼime gị si e ji ike ha nwere na-awụsi ọbara. 7A na-elelị nne na nna nʼime gị. Ndị mbịarambịa ka e ji anya ike na-emegbu. Ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ ka a na-akpagbu, na-emejọkwa. 8I lelịala ihe nsọ m niile, merụọkwa ụbọchị izuike m niile. 9Ndị nkwutọ, ndị na-awụsi ọbara nọ nʼime gị. Ndị na-eri nri nʼihu arụsị niile dị nʼelu ugwu, na ndị na-eme omume rụrụ arụ nọkwa nʼime gị. 10Nʼime gị ka ndị na-akwaso nwunye nna ha iko dị, nʼime gị ka ndị na-awakpo ụmụ nwanyị mgbe ha nọ na nsọ ha, bụ mgbe ha nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.