Native Bible

Ezekiel 22:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nwa nke mmadụ, ụlọ Izrel aghọọlara m ihe efu. Ha niile aghọọla ọla, na gbamgbam, na igwe, na ọla opu a hapụrụ nʼọkụ. Ha bụ nnọọ ihe efu nke ọlaọcha.

Ezekiel 22:18 in English

Ezekiel 22:18 · Berean Standard Bible

“Son of man, the house of Israel has become dross to Me. All of them are copper, tin, iron, and lead inside the furnace; they are but the dross of silver.

Context

16Mgbe e mere ka ị ghara ịdị nsọ nʼanya ndị mba dị iche iche, ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ” 17Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 18“Nwa nke mmadụ, ụlọ Izrel aghọọlara m ihe efu. Ha niile aghọọla ọla, na gbamgbam, na igwe, na ọla opu a hapụrụ nʼọkụ. Ha bụ nnọọ ihe efu nke ọlaọcha. 19Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: ‘Nʼihi na unu niile aghọọla ihe efu, aga m achịkọta unu nʼime Jerusalem. 20Dịka a na-achịkọta ọlaọcha, na ọla, na igwe, na opu, na gbamgbam, tinye ha nʼoke ọkụ ka ha gbazee, otu a ka m ga-esite nʼiwe m na ọnụma m chịkọtaa unu nʼime obodo ahụ gbazee unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.