Izikiel 21:9
Ezekiel 21:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nwa nke mmadụ buo amụma sị, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Lee, mma agha, lee, mma agha, a mụọla ya, hichakwaa ya.
Ezekiel 21:9 in English
Ezekiel 21:9 · Berean Standard Bible
“Son of man, prophesy and tell them that this is what the Lord says: ‘A sword, a sword, sharpened and polished—
Context
7Mgbe ha jụrụ gị, ‘Gịnị kpatara i ji asụ ude?’ Ị ga-asị, ‘Nʼihi ozi nke na-abịa. Obi niile ga-agbaze site nʼegwu, aka niile ga-akụdakwa; mmụọ niile ga-ada mba,* ikpere niile ga-ede mmiri site nʼamịrị.’ Ọ na-abịa, ọ ghaghị imezu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.” 8Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 9“Nwa nke mmadụ buo amụma sị, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Lee, mma agha, lee, mma agha,
a mụọla ya, hichakwaa ya. 10Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị,
hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma.
“ ‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya. 11“ ‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ,
ka e jidekwa ya nʼaka.
A mụọla ya, hichazie ya.
E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.