Native Bible

Ezekiel 21:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nʼihi ya, sụọ ude, nwa nke mmadụ, sụọ ude nʼihu ha nʼọnọdụ oke mwute na obi mgbawa.

Ezekiel 21:6 in English

Ezekiel 21:6 · Berean Standard Bible

But you, son of man, groan! Groan before their eyes with a broken heart and bitter grief.

Context

4Nʼihi na m na-aga igbuchapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume, mma agha m ga-esite nʼọbọ ya pụta megide onye ọbụla site nʼugwu ruo na ndịda. 5Mgbe ahụ, mmadụ niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị amịpụtala mma agha m site nʼọbọ ya, ọ gaghị amịghachi baa nʼọbọ ọzọ.’ 6“Nʼihi ya, sụọ ude, nwa nke mmadụ, sụọ ude nʼihu ha nʼọnọdụ oke mwute na obi mgbawa. 7Mgbe ha jụrụ gị, ‘Gịnị kpatara i ji asụ ude?’ Ị ga-asị, ‘Nʼihi ozi nke na-abịa. Obi niile ga-agbaze site nʼegwu, aka niile ga-akụdakwa; mmụọ niile ga-ada mba,* ikpere niile ga-ede mmiri site nʼamịrị.’ Ọ na-abịa, ọ ghaghị imezu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.” 8Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.