Native Bible

Ezekiel 20:46 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ ndịda. Kwuokwa okwu megide ala ahụ dị na ndịda, na oke ọhịa niile dị na ndịda.

Ezekiel 20:46 in English

Ezekiel 20:46 · Berean Standard Bible

“Son of man, set your face toward the south,* preach against it, and prophesy against the forest of the Negev.

Context

44Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesochara unu mmeso nʼihi aha m, na-agụghị ajọ omume unu maọbụ otu ụzọ ọjọọ niile unu si dị, unu bụ ụlọ Izrel. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.’ ” 45Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 46“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ ndịda. Kwuokwa okwu megide ala ahụ dị na ndịda, na oke ọhịa niile dị na ndịda. 47Sị oke ọhịa ndịda ahụ, ‘Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ana m akwado isunye gị ọkụ, nke ga-erechapụ osisi niile dị nʼime gị, ma ndị dị ndụ ma ndị kpọnwụrụ akpọnwụ. A pụghị imenyụ oke ọkụ ahụ, ọ ga-erechapụkwa ihu niile site na ndịda ruo nʼugwu niile. 48Ihe niile bụ mmadụ, ga-ahụ na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, sunyere ọkụ ahụ. A gaghị emenyụkwa ya.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.