Izikiel 18:29
Ezekiel 18:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Ọ bụ nʼụzọ m niile ezighị ezi, unu ụlọ Izrel? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi?
Ezekiel 18:29 in English
Ezekiel 18:29 · Berean Standard Bible
Yet the house of Israel says, ‘The way of the Lord is not just.’ Are My ways unjust, O house of Israel? Is it not your ways that are unjust?
Context
27Ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume niile nke o mere chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-azọpụta ndụ ya. 28Nʼihi na ọ tuleela nʼobi ya, kpebiekwa ịhapụ mmehie ya niile, ma malite ibi ndụ ziri ezi. Ndụ ga-abụ nke ya. Ọ gaghị anwụ. 29Ma ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Ọ bụ nʼụzọ m niile ezighị ezi, unu ụlọ Izrel? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi? 30“Ya mere, unu ụlọ Izrel, aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. Chegharịanụ, sitenụ na njehie unu niile unu chigharịa, mgbe ahụ, mmehie agaghị a bụrụ unu ihe ịsọ ngọngọ. 31Wezuganụ njehie niile unu jehiere nʼime ya, ka unu nweta obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ. Ụlọ Izrel, gịnị mere unu ga-eji nwụọ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.