Izikiel 18:27
Ezekiel 18:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume niile nke o mere chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-azọpụta ndụ ya.
Ezekiel 18:27 in English
Ezekiel 18:27 · Berean Standard Bible
But if a wicked man turns from the wickedness he has committed and does what is just and right, he will save his life.
Context
25“Ma unu na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel. Ọ bụ nʼụzọ m ezighị ezi? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi? 26Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime mmehie, ọ ga-anwụ maka ya; nʼihi mmehie ahụ o mere ka ọ ga-anwụ. 27Ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume niile nke o mere chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-azọpụta ndụ ya. 28Nʼihi na ọ tuleela nʼobi ya, kpebiekwa ịhapụ mmehie ya niile, ma malite ibi ndụ ziri ezi. Ndụ ga-abụ nke ya. Ọ gaghị anwụ. 29Ma ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Ọ bụ nʼụzọ m niile ezighị ezi, unu ụlọ Izrel? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.